TJS TurboFlux Journal System TurboFlux Journal System

ODEZURUIGBO JOURNAL

Nnamdi Azikiwe University, Awka, Nigeria

Open Access Peer Reviewed ISSN: 2672-4243
Research article open Vol. 5 No. 1 (2021)

AKWAMOZU NWAỌKPỤ NA NNEWI N’OGE UGBU A: MGBANWE NA NSOGBU YA

Onyekelu Ann C, Ejioforbiri Chidimma A · Pages 1-16 · December 11, 2022

ISSN 2672-4243

Authors

  • Onyekelu Ann C Corresponding author
  • Ejioforbiri Chidimma A

Abstract

Ụmị edemedeAkwamozu nwaọkpụ bụ otu n'ime omenala e nwere na Nnewi nke e ji eme ka mkpụrụobi nwaọkpụnwụrụ anwụ laruo n'udo. Usoro akwamozu na Nnewi malitere n'oge gboo dịwa ire mana ọtụtụmgbanwe na nleghara anya batara na ya site n'ọbịbịa ụka Kraịst nakwa mmepe obodo. Mgbanwe ndị a batara n'akwamozu nwaọkpụ mere ka ndị mmadụ leghara ụfọdụ mmemme a na-eme n'ime akwamozu a anya, nke butere nsogbu dị iche iche dị ka ọnwụ ike, ajọ ọrịa, ndaghachi azụ n'ezinụlọdị iche iche nakwa nkewa na ịkpọ asị n’etiti ndị ụka Kraịst na ndị anaghị eje ụka Kraịst. Nke a kpalitere mmụọ nwanchọcha ime nchọcha n'isi okwu a iji chọpụta kpọmkwem ihe na-ebute nsogbu ndị a ma chọpụta ụzọ a ga-esi gbanahụ nsogbu ndị a. A gbasoro usoro sòvee wee mee nchọcha a. A gbara ndị okenye asatọ nọ n'agbata afọ iri isii na iri asatọ ajụjụ ọnụ iji nweta ụsa dabara adaba. E mekwara nnyocha agụmagụ iji chọpụta ihe ndị ọzọ kwugara maka nwaọkpụ, akwamozu nakwa akwamozu nwaọkpụ. A chọpụtara na e nweela mgbanwe dị iche iche n'ihe gbasara ili ozu nwaọkpụ, ịkwa ozu nwaọkpụ, na ibuna ngịga. Nchọcha a ga-abara ndị Nnewi nakwa obodo niile gbara ya gburugburu uru iji ghọta ihe dị n'akwamozu nwaọkpụ ma gbanahụ ntaramahụhụ nwere ike isi na ya pụta. Na nchịkọta, ndị Nnewi kwesiri ịkwa nwaọkpụ ha ọbụla nwụrụ anwụ dị ka nkwenye na ekpemekpe ya si dị, ka udo, agamnihu na ịhụnanya wee dị n'obodo Nnewi

Keywords

Akwamozu

How to cite

No formats match your search.

Pick a style from the searchable list. Download uses the format currently selected.

Reference managers: RIS · BibTeX · EndNote

In-text (APA): (C & A, 2022) · C and A (2022)