MMEMME ERIMJI ỌHỤRỤ N’OGHE
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
Authors
- Christian E. C. Ọgwụdịle Corresponding author
Abstract
Ụmị EdemedeMmemme iri ji ọhụrụ dị ka aha ya si dị bụ ihe a na-eme were eri ji izizi e gwuputara n‘ala. Ọbụ mmemme a ka a na-eme tupu onye ọbụla kọrọ ji enwee ike igwute nke ya rie. N‘obodo mbụ Oghe ọ bụ mmemme na-ejikọta mmadụ niile ọnụ ma ndị kọrọ ji ma ndị akọghị ya.Ebumnobi nchọcha a bụ ịkọ maka iri ji ọhụrụ n‘Oghe. Nwanchọcha lebekwara anya makọwaa ma e nwere myiri na ndịiche dị n‘etu ndị Oghe si eri ji ọhụrụ na etu ndị Igbo ndị ọzọsi eri ya. Usoro nchọcha a bụ na nwanchọcha gbara ụfọdụ ndị okenye na ndị maara etu e sieme mmemme iri ji ọhụrụ ajụjụ ọnụ. Ọ gakwara n‘ọba akwụkwọ dị iche iche gụọ ụfọdụ ihendị odee dere banyere oriri ji ọhụrụ n‘ala Igbo. Atụtụ a gbasoro mee nchọcha bụ atụtụnkọwa. Nchọpụta e mere gosiri na e nwere myiri na ndịiche dị n‘etu ndị Oghe si eri ji ọhụrụna etu ndị Igbo ụfọdụ si eri ya n‘ihi na ọkwa mba na-achị n‘olu n‘olu. Nwanchọcha tụrụ aloka ndị Igbo jidesie omenala oriri ji ọhụrụ aka ike ka ọ bụrụ mmemme a gaghị enwe ihe gaegbochi ya ịga n‘ihu, ka ọ bụrụ nwa tote, o tokwuru.