MGBASA EJEMOZI ỤKA MMỤỌ NSỌ NA NAỊJIRỊA KAMGBE AGHA BIAFRA NA NAỊJIRỊA BIRI: ETU IHE SI GBATA KWỤRỤ
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
Authors
- Daniel Ihunanya Ilechukwu Corresponding author
- Chiamaka Patience Ilechukwu
Abstract
Ụ mị EdemedeNdị ka Mmụọ Nsọ bụ ndị nkụzi ha, ozizi ha na nkwenye ha gbadoro ụkwụ n‘ike nkeMmụọ Nsọ Chineke. Ha na-agbaso usoro ofufe a haziri ahazi ma na-agba mbọ ịkụzi ihe dịn‘Akwụkwọ Nsọ n‘agbanweghị ya. Onye ọbụla dị n‘otu usoro ekpemekpe a ka a na-akpọ naBekee (a pentecostal). Ihe gbasara ha na ije ozi ha ka a na-akpọ (pentecostalism). Ederede achọpụtara mgbe ije ozi ndị ụka Mmụọ Nsọ malitere, ihe bụ ebumnobi ha mgbe ha malitereọhụrụ, agamnihu ha kamgbe ha malitere na ụ rụ dị iche batarala n‘ije ozi ha tụmadụ n‘ogeugbu a. E ji ụfọdụ n‘ime ha a ma ama na Naịjiria mere ebe mgbado ụkwụ nnyocha ederedea. ka Mmụọ Nsọ malitere na Naịjirịa na mbido 1970. Ederede a gbara ndahie ndị ndu han‘anwụ n‘agbanyeghị ezi ebumnobi ha ji malite. Nke a mere ezi ebumnobi ndị a ji akpụziafọ n‘ala taataa. Ederede a gosipụtara ndahie ndị isi ụka Mmụọ Nsọ ma gbaa ndị ka kwụchịm n‘okwukwe ha ume ka ha na-aga n‘ihu n‘ezi ọrụ ha. Ederede a bụ nke nkọwasị, n‘ihiya e jighị atụtụ ọ bụla nyocha ya. Ederede a ga-eme ka ndị hierela ụzọ n‘ ka Mmụọ Nsọchighakwute Chineke ma meghee anya ndị a na-achọ iduhie ụzọ ka a ghara idupu han‘okwukwe. E nyere ndụmọdụ ka ndị niile bụ ndị otu ka Mmụọ Nsọ gbaa mbọ wepụ okeọchịchọ, amụma ụgha, oke ịchụ nta ego na arụrụala ndị ọzọ dị iche iche ka Chineke wee jiriụka a rụpụta ebumnobi Ya n‘ọ gbọ a gbagọrọ agbagọ. Usoro nkanye akara ụda olu a gbasorobụ nke Green na Igwe 1963. N‘ụdịdị a, a gaghị akanye ụda elu, mana a ga-akanye ụda ala naụda nsụda.